IGBA
12/06/2023
Ị BỤRỤ NKE M Ọ GỊNỊ FỌDỤZỊ ?
E lechaa na mụ anya ma chee ya echee,
A tulee la m ya ma nyochaa ya dịka onyokomita,
Ọ dighị kwa ihe mgbakwoju anya m hụrụ.
Naanị ihe na-adị m mma ka m hụrụ.
Ọ nwere ihe mmadụ ga-ahụ o rie ya ọnụ,
Ahụ ihe karịrị nte sị ree ọba,
Na Dịbịa gbara afa ugboro abụọ abụghị na Dibịa amaghị afa agba k**a ihe ọ hụrụ dị n'ụdị ọzọ,
Apụnanwụ, a hụrụ m gị gbakaa kpebie nọ n'ebe a ka mụ ga-ebi nje m.
Neenụ nwa amụrụ ya na mma,
Ọmaụmaasahụ,
Eleweukwuegbuewu,
Ọmalicha,
Anyanwụtụtụ !!!
Utọnwa, biko nwere nwayọọ na-aga ka m na- agba gị nkiri maka n' i medaala obi m,
Naanị anya m hụrụ mere m o nweghizi ihe na-aghọta,
Chaịị , Ọ ka ije lọọvụ a sị adị ?
Ewww chi m.
Ụtọnwa, kpụdebe mụ nso ka m gwa gị ka o si di m n' obi,
A maghị m ka o si mee, mana o doro mụ anya nọọ n' ebe ịnọ ka m ga-awụsa ọwa m,
Nne,bụrụ Ugegbe m ,a ga m abụkwa Ọdinobi gi,
Tulee obi m ka ị hụ na- e nwere m ezi ebumnobi ebe ị nọ,
A bịaghị m ka m jiri aghụghọ nara ngọzị.
Ọmaụmasaahụ,
Eleweukwuegbuewu,
A hụrụ m gị wee ree ọba,
Lee nu mụ anya ịhụnanya ka anyi wee bụrụ otu kporibe ụwa,
Ụwa na-atọ ụtọ ma adị abụọ na eme ya.
Nne,n'ezie ị bụrụ nke m, ọ gịnị fodụrụ ?
© Anyabolu Ifeanyichukwu Dominion
Click here to claim your Sponsored Listing.
Category
Website
Address
Onitsha
430264